Journalist Obum
News around the globe, interview, Sports and entertainment
06/06/2026
Biko, biko, biko ụmụnne m, ka onye ọ bụla kpachara anya ma na-elekọta onwe ya nke ọma. Ọnọdụ obodo ugbu a adịghị mma.
Ndị ji ngwa ọgụ nọ ebe niile, ndị na-eme ihe ike nọ n’Ugwu na mpaghara Yoruba. Maka nchekwa anyị niile, biko ka anyị kwụsị ikwu atụmatụ anyị n’ihu ọha ma ọ bụ n’otu.
Ka anyị debe ihe anyị n’ime obi. Ha ekwesịghị ịma ihe anyị na-eme ma ọ bụ atụmatụ anyị.
Biko, ana m arịọ unu n’aha Chineke.
Ka anyị nọgide bụrụ ndị udo, ndị na-eche nche, ma bụrụkwa otu n’oge nsogbu a. Ka onye ọ bụla nọrọ na nchekwa ma na-elekọta ibe ya.🙏🏻🙏🏻🙏🏻🙏🏻
Click here to claim your Sponsored Listing.
Category
Address
Awka